2 Chronicles 28:15 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ndikom ahu ndi akpọrọ n'aha n'aha we bilie, jide ndọta-n'agha ahu, yikwasi ndi-ha b͕ara ọtọ uwe site n'ihe-nkwata ahu, ha we yikwasi ha uwe, yikwasi kwa ha akpukpọ-ukwu, me ha ka ha rie ihe, me kwa ha ka ha ṅua ihe-ọṅuṅu, te ha manu, nēdu ha n'elu inyinya-ibu, bú onye ọ bula nāsu ngọngọ, ha we me ka ha biarue Jeriko, bú obodo ukwu, di umu-nne-ha nso: ha we laghachi na Sameria.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, ndị ikom ahụ akpọrọ nʼaha nʼaha duuru ndị mkpọrọ ahụ, manye aka nʼihe ahụ niile a dọtara nʼagha wepụta uwe, na nri, na mmanya na akpụkpọụkwụ, na mmanụ, nyeghachi ha ndị ahụ niile a dọtara nʼagha. Ha bulitere ndị ọrịa nọ nʼetiti ndị ahụ a dọtara nʼagha kukwasị ha nʼelu ịnyịnya ibu. Emesịa, ha duuru mmadụ ahụ niile dughachiri ha ndị ha nọ na Jeriko, obodo nkwụ. Emesịakwa, ha laghachikwara azụ na Sameria.