2 Chronicles 29:16 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ndi-nchu-àjà we ba n'ime-ime nke ulo Jehova, ime ka o di ọcha, ha we buputa ihe ruru árú nile nke ha chọtara n'ulo uku Jehova tiye ya n'ogige ulo Jehova. Ndi Livai we nara ya, ibupu ya je miri-iyi Kidron n'èzí.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị nchụaja banyere nʼime ebe nsọ ahụ ido ya nsọ. Ihe niile na-adịghị ọcha ha hụrụ nʼime ya ka ha wepụtasịrị nʼogige ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ. Ndị Livayị buuru ha gaa bufuo na Ndagwurugwu Kidrọn.