2 Chronicles 29:17 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ha we malite ido nsọ n'ubọchi mbu nke ọnwa mbu, n'ubọchi nke-asatọ nke ọnwa ka ha biaruru uzọ-nbata Jehova; ha we do ulo Jehova nsọ n'ubọchi asatọ: ọ bu kwa n'ubọchi nke-iri-na-isi nke ọnwa mbu ka ha dobìri ya nsọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha bidoro mmemme ido nsọ a nʼabalị mbụ nʼọnwa nke mbụ. Nʼabalị nke asatọ ha ruru na mpụta ọnụ ụlọ nke ụlọnsọ Onyenwe anyị. Ma o were ha abalị asatọ ọzọ idochasị ụlọnsọ ahụ nsọ maka ofufe, ha jezuru ozi niile nʼabalị iri na isii nke ọnwa mbụ ahụ.