2 Chronicles 29:24 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
ndi-nchu-àjà we b͕ue ha, were ọbara-ha chua àjà-nmehie n'ebe-ichu-àjà, ikpuchiri Israel nile nmehie: n'ihi na eze siri, Ọ diri Israel nile, bú àjà-nsure-ọku a na àjà-nmehie a.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị nchụaja gburu mkpi ndị ahụ, chee ọbara ha nʼelu ebe nchụaja maka ikpuchi mmehie ndị Izrel niile. Nʼihi na eze nyere iwu ka a chụọ aja nsure ọkụ na aja mmehie nʼihi ndị Izrel niile.