2 Chronicles 29:34 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Nání na ndi-nchu-àjà di ole-na-ole, ha apughi kwa ib͕a akpukpọ anu àjà-nsure-ọku nile: umu-nne-ha, bú ndi Livai, we me ka ha di ike, rue mb͕e ejebìri ozi ahu, ru kwa mb͕e ndi-nchu-àjà doro onwe-ha nsọ: n'ihi na ndi Livai nwere obi ziri ezi kari ndi-nchu-àjà ido onwe-ha nsọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ndị nchụaja dị ole na ole, ha apụghịkwa ịgba akpụkpọ anụ niile ahụ maka aja nsure ọkụ, nʼihi ya, ụmụnne ha bụ ndị Livayị nyeere ha aka tutu ruo mgbe ozi ahụ gwụsịrị, ruokwa mgbe e doro ndị nchụaja ndị ọzọ nsọ. Nʼihi na ndị Livayị nwere obi ziri ezi karịa ndị nchụaja ido onwe ha nsọ.