2 Chronicles 3:12 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Nkù cherub nke-ọzọ di kwa cubit ise, nēmetu mb͕idi ulo: nkù-ya nke-ọzọ di cubit ise, nārapara na nkù cherub nke-ọzọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼotu aka ahụ, otu nku cherub nke abụọ ruru mita abụọ na ọkara nʼogologo. Ọnụ nku ya na-emetụ akụkụ nke ọzọ nke ahụ ime ụlọnsọ ukwu, ma nku ya nke ọzọ, nke rukwara mita abụọ na ọkara nʼogologo, na-emetụ ọnụ ọnụ otu nku cherub nke mbụ.