2 Chronicles 3:15 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
O me kwa n'iru ulo ogidi abua, orú cubit na iri na ise ka ogologo-ha di, isi nke di n'elu-ha n'otù n'otù di kwa cubit ise.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O wuru ogidi abụọ dị nʼihu ụlọnsọ ahụ, nke ịdị elu ya ruru mita iri na asaa. Ọ kpụkwara ihe a dokwasịrị nʼelu ogidi ndị a, nke ịdị elu ha dị mita abụọ na ọkara.