2 Chronicles 30:21 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Umu Israel ndi ahuru nime Jerusalem we me ememe achicha ekoghi-eko ubọchi asa n'ọṅù uku: ndi Livai na ndi-nchu-àjà nēto kwa Jehova kwa-ubọchi, chiri ihe nādasi udà ike nēto Jehova.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, ndị Izrel ahụ niile ji ọṅụ mee mmemme achịcha ekoghị eko ahụ na Jerusalem ụbọchị asaa. Ma ndị nchụaja na ndị Livayị ji abụ na ngwa egwu Onyenwe anyị too ya otuto ụbọchị ahụ niile.