2 Chronicles 30:22 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Hezekaia we gwa ndi Livai nile okwu nābà ha n'obi, bú ndi nwere ezi uche bayere Jehova. Ha we rie ihe ahu akara àkà ubọchi asa ahu, nāchu àjà, bú àjà-udo, nēkele kwa Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Hezekaya ji okwu dị mma gbaa ndị Livayị ume nʼihi ezi nghọta ha nwere nʼijere Onyenwe anyị ozi. Nʼime ụbọchị asaa ahụ niile, ha chụrụ aja udo, riekwa ihe ha ketara site nʼaja niile a chụrụ. Ha tokwara Onyenwe anyị Chineke nna nna ha otuto.