2 Chronicles 32:24 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Na mb͕e ahu Hezekaia riara ọria rue inwu: o we kpere Jehova; O we gwa ya okwu, nye ya ihe-ebube.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma nʼoge ahụ, Hezekaya rịara ọrịa, ruo na ọ gaara anwụ. Ma o kpere ekpere rịọ Onyenwe anyị ka ọ gwọọ ya. Ọ zara ekpere ya, gosikwa ya ihe ịrịbama dị ebube.