2 Chronicles 33:15 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
O wezuga-kwa-ra chi nile nke ala ọzọ, si kwa n'ulo Jehova wezuga oyiyi-ihe ahu, ya na ebe-ichu-àjà nile nke o wuru n'ugwu ulo Jehova, na nime Jerusalem, o kpofue ha n'azu obodo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O wezugara chi ndị mba ọzọ niile, wepụkwa oyiyi ahụ o tinyere nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, kụtuokwa ụlọ arụsị o wuru nʼugwu ụlọnsọ, na ndị nke o wuru na Jerusalem. O sitere nʼobodo bufuo ha.