2 Chronicles 33:19 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ekpere-ya kwa, na otú ekwere ka ọ riọta ìhe, na nmehie-ya nile, na nmekpu-ya, na ebe nile nke o wuru ebe di elu nime ha, guzo kwa Asherim na arusi apiri api, tutu o ruru ala: le, edewo ha n'akwukwọ okwu Hozai.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ekpere ya, na ọsịsa Chineke zara ya, na mmehie ya niile, na-ekwesighị ntụkwasị obi ya, na ebe niile o wuru ụlọ arụsị nʼelu ugwu, na ebe ọ manyere ogidi arụsị Ashera, na arụsị ndị ọzọ, tupu o weda onwe ya ala, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ndị amụma.