2 Chronicles 34:3 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma n'arọ nke-asatọ nke ọ bu eze, mb͕e ya onwe-ya nọ na nwata, ọ malitere ichọ Chineke nke Devid nna-ya: n'arọ nke-iri-na-abua ka ọ malite-kwa-ra ime Juda na Jerusalem ka ha di ọcha pua n'ebe di elu nile, na Asherim, na arusi nile apiri api, na arusi nile awuru awu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼafọ nke asatọ nke ọchịchị ya, mgbe ọ ka bụ okorobịa, o bidoro iji obi ya niile na-achọ Chineke nke nna ya Devid. Nʼafọ iri na abụọ nke ọchịchị ya, ọ malitere ime ka Juda na Jerusalem dị ọcha site nʼiwezuga ebe ịchụ aja niile dị elu, na ogidi Ashera niile, na arụsị a pịrị apị na nke a kpụrụ akpụ niile.