2 Chronicles 34:8 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma n'arọ nke-iri-asatọ nke ọ bu eze, mb͕e ọ mesiri ka ala-ya na ulo ahu di ọcha, o zigara Shefan nwa Azalia, na Maaseia, bú onye-isi obodo ahu, na Joa nwa Joahaz, bú onye-ncheta, ime ulo Jehova, bú Chineke, ka ọ di ike.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Josaya, mgbe o mere ka ala ahụ na ụlọnsọ dị ọcha, o zigara Shefan nwa Azalaya, Maaseia onye na-achị obodo, na Joa nwa Joahaz, onye na-edekọ akụkọ, ka ha wuzie ụlọnsọ Onyenwe anyị, bụ Chineke ya.