2 Chronicles 34:9 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ha we biakute Hilkaia, bú onye-isi-nchu-àjà, nye ya ego ahu nke anēwebata n'ulo Chineke, nke ndi Livai, bú ndi nēche nbata-uzọ, chikọtara n'aka ndi Manase na Efraim, na n'aka ndi nile fọduru nke Israel, na n'aka Juda na Benjamin nile na ndi bi na Jerusalem.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha jekwuru Hilkaya onyeisi nchụaja nye ya ego nke e webatara nʼụlọnsọ Chineke, nke ndị Livayị bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ nakọtara site nʼaka ndị Manase na Ifrem, na ndị niile fọdụrụ nʼIzrel, na sitekwa nʼaka ndị Juda na Benjamin, na ndị niile bi na Jerusalem.