2 Chronicles 35:12 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ha we wezuga àjà-nsure-ọku, inye ha dika nkewa nile nke ulo nke ndi bu nna umu ndi Israel si di, iweta ha nso Jehova, dika edeworo ya n'akwukwọ Moses. Otú a ka eme-kwa-ra ehi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha kenyere ezinaụlọ ọbụla anụ ndị ahụ niile ka ha jiri nke ha ketara chụọ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị nʼusoro dịka e dere nʼime akwụkwọ Mosis. Otu a ka ha mekwara banyere ehi ndị ahụ.