2 Chronicles 35:15 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ndi-ọbù-abù, bú umu Esaf, nọ kwa n'ebe-nguzo-ha, dika ihe Devid, na Esaf, na Himan, na Jedutun, bú onye-ọhu-uzọ eze, nyere n'iwu si di; ndi-ọnu-uzọ-ama nọ kwa n'ọnu-uzọ-ama nile ọ bula: ha enweghi ike isi n'òfùfè-ha wezuga onwe-ha, kama umu-nne-ha, bú ndi Livai, doziri ihe nye ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị ikwu Asaf ndị a, bụ ndị na-abụ abụ, nọkwa nʼọnọdụ ha nʼusoro dịka ihe Devid, na Asaf, na Heman, na Jedutun onye amụma eze nyere nʼiwu. Ndị na-eche nche nʼọnụ ụzọ ama ahapụghị ọnọdụ ha, nʼihi na ndị Livayị ibe ha doziri ihe debere ha.