2 Chronicles 35:3 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ọ si ndi Livai, bú ndi nēme Israel nile ka ha ghọta ihe, ndi di nsọ n'ebe Jehova nọ, Tiyenu ib͕e nsọ n'ulo ahu nke Solomon nwa Devid, bú eze Israel, wuru; ibu agaghi-adiri unu n'ubu: ub͕u a fènu Jehova, bú Chineke-unu, na ndi-Ya, bú Israel, òfùfè.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ sịrị ndị Livayị, bụ ndị e doro nsọ nye Onyenwe anyị, ndị na-emekwa ka ndị Izrel ghọta ihe, “Dọnyenụ igbe nsọ ahụ nʼụlọnsọ ukwu ahụ Solomọn, nwa Devid, bụ eze Izrel wuru. Unu ekwesịkwaghị ị na-ebugharị ya nʼubu unu ọzọ. Ugbu a jeerenụ Onyenwe anyị Chineke unu, na ndị ya Izrel ozi.