2 Chronicles 36:10 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ma n'ọb͕ub͕a arọ, eze, bú Nebukadneza, zìri, me ka ọ biarue Babilon, ya na ihe nile anāchọsi ike nke ulo Jehova, o we me Zedakaia, bú nwa-nne-ya, eze Juda na Jerusalem.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Emesịa, nʼafọ nke ọzọ ya, Nebukadneza ziri ozi mee ka akpọrọ ya, na ọtụtụ ihe ndị dị oke ọnụahịa sitere nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, bulaa ha Babilọn nʼoge a. O mere nwanne nna Jehoiakin bụ Zedekaya, eze Juda na Jerusalem.