2 Chronicles 5:13 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
o we rue, mb͕e ndi nāfù opì na ndi-ọbù-abù di ka otù onye, ime ka anu otù olu n'ito na n'ikele Jehova, mb͕e ha were kwa opì na ájà, na ihe abù, na otuto eji to Jehova, welie olu-ha elu, si, N'ihi na Ọ di nma: n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: na igwe-oji juputara ulo ahu, bú ulo Jehova,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị ọbụ abụ ahụ na ndị na-afụ opi jikọrọ onwe ha ọnụ were otu olu bụkuo Onyenwe anyị abụ ekele na otuto. Ndị na-afụ opi, na ndị na-akụ ọla na-ada ụda, na ndị ji ngwa egwu ndị ọzọ sonyeere ha, welie olu ha elu too Onyenwe anyị nʼabụ sị: “Nʼihi na Ọ dị mma Ịhụnanya ya na-adị ruo ebighị ebi.” Mgbe ahụ igwe ojii jupụtara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị,