2 Chronicles 6:13 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
(n'ihi na Solomon mere ebe-nguzo di elu nke ọla-cubit ise ka ogologo-ya di, cubit ise ka obosara-ya di kwa, cubit atọ ka idi-elu, ya di kwa, o we tiye ya n'etiti ogige; o we guzo n'elu ya, b͕u ikperè-ya n'ala n'iru nkpọkọta nile nke Israel, b͕asa ọbu-aka-ya abua n'ebe elu-igwe di:)
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Solomọn ji bronz kpụọ ihe nrigoro ịnọ gwa ọha mmadụ okwu. Ogologo ihe nrigoro ahụ, obosara ya ruru mita abụọ na ọkara mita abụọ na ọkara. Ịdị elu ya ruru otu mita na ọkara. O debere ya nʼetiti ebe mpụta nke ogige ụlọnsọ ukwu ahụ. O guzoro nʼelu ihe nrigo ahụ, nʼihu ọgbakọ Izrel niile, gbuo ikpere nʼala, gbasaa aka ya abụọ chilie ha elu.