2 Chronicles 6:14 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
ọ si, Jehova, bú Chineke Israel, ọ dighi Chineke dika Gi, n'elu-igwe, ma-ọbu n'uwa; I nēdebere ndi-orù-Gi ọb͕ub͕a-ndu na ebere, bú ndi were obi-ha nile nējeghari n'iru Gi:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ sịrị, “ Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel, ọ dịghị Chineke dịka gị nʼeluigwe maọbụ nʼụwa. Gị onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya gị na ndị ohu gị, bụ ndị ji obi ha niile na-eso ụzọ gị.