2 Chronicles 6:41 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma ub͕u a, bilie, Jehova, bú Chineke, ba n'ebe-izu-ike-Gi, Gi onwe-gi na ib͕e nke ike-Gi: Jehova, bú Chineke, ka ndi-nchu-àjà-Gi yiri nzọputa dika uwe, ka ndi-ebere-Gi ṅuri kwa ọṅu n'idi-nma.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ma ugbu a, bilie, O Onyenwe anyị Chineke, bata nʼebe izuike gị, gị na igbe ọgbụgba ndụ nke ike gị. Ka ndị nchụaja gị, O Onyenwe anyị Chineke, yiri nzọpụta dịka uwe. Ka ndị gị kwesiri ntụkwasị obi ṅụrịa ọṅụ nʼihi ịdị mma gị.