2 Chronicles 7:3 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Umu Israel nile nēlekwasi kwa nrida ọku ahu anya, ya na ebube Jehova nke di n'elu ulo ahu; ha we ruru ala, kpuchie iru-ha n'ala n'elu pavement, kpọ isi ala, we kele Jehova, si, N'ihi na Ọ di nma; n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọha ndị Izrel niile hụrụ ọkụ ahụ si nʼelu daa, hụkwa ebube Onyenwe anyị ka o guzo nʼelu ụlọnsọ ukwu ahụ, ha dara nʼala kpọọ isiala nye Onyenwe anyị, kelee ya ekele sị: “Nʼihi na Ọ dị mma ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”