2 Chronicles 7:6 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ndi-nchu-àjà nēguzo kwa, dika ihe-ndebe-ha si di; ha na ndi Livai, ndi chiri ihe abù Jehova, nke Devid, bú eze, mere ikele Jehova, n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di, mb͕e Devid nēto Chineke site n'aka-ha: ndi-nchu-àjà nāfù kwa opì n'iru ha; Israel nile nēguzo kwa.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị nchụaja guzo nʼihu ọrụ ha, ha na ndị Livayị. Ha jiri ngwa egwu Onyenwe anyị nke eze Devid mere maka ị na-eto Onyenwe anyị, bụkwa nke o ji mgbe o nyere ekele, na-asị, “Ịhụnanya ya na-adị ruo ebighị ebi.” Na ncherita ihu ndị Livayị, ndị nchụaja fụrụ opi ike ha mgbe ndị Izrel guzooro ọtọ.