2 Chronicles 8:11 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Solomon we me ka nwa-nwayi Fero si n'obodo Devid rigorue ulo ahu nke o wuru nye ya: n'ihi na ọ siri, Nwunye m'nwere agaghi-ebi n'ulo Devid, bú eze Israel, n'ihi na ebe nile di nsọ, bú nke ib͕e Jehova bataworo nime ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Solomọn kpọpụtara ada Fero site nʼobodo Devid, gaa nʼụlọeze nke o wuuru ya, nʼihi na ọ sịrị, “Nwunye m agaghị ebi nʼụlọeze Devid, bụ eze Izrel, nʼihi na ebe ọbụla igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị banyere abụrụla ebe dị nsọ.”