2 Chronicles 8:18 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Huram we zitere ya ub͕ọ na ndi-orù ndi mara oké osimiri n'aka ndi-orù-ya; ha na ndi-orù Solomon we biarue Ofia, si n'ebe ahu weta nnù talent ọla-edo na ọgu abua na iri, wetara eze, bú Solomon.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Hiram zigaara ya ọtụtụ ụgbọ mmiri nke ndị ikom ya na-anya ụgbọ mmiri na-edu, bụ ndị maara ihe banyere ime njem nʼosimiri nke ọma. Ndị a, ha na ndị ikom Solomọn nyaara ụgbọ gaa Ọfịa site nʼebe ahụ bulatara eze Solomọn, ọlaedo ịdị arọ ya ruru puku kilogram iri na ise na narị atọ.