2 Chronicles 9:1 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ma eze-nwayi Sheba nuru akukọ Solomon, we bia iwere ilu di iche iche nwa Solomon nime Jerusalem, ya na usu di ọtutu nke-uku, na camel nēbu uda di iche iche, na ọla-edo n'uba, na nkume di oké ọnu-ahia: o we biakute Solomon, kpayere ya uka nile nke di ya n'obi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe eze nwanyị Sheba nụrụ akụkọ Solomọn, ọ bịara Jerusalem ka o were ọtụtụ ajụjụ siri ike nwalee ya. O du ọtụtụ ndị ozi bara ụba bịa, tinyere ọtụtụ ịnyịnya kamel ndị bu ụda dị iche iche, ọtụtụ ọlaedo na ọtụtụ nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche. Ọ bịakwutere Solomọn, ya na ya kparịtara ụka banyere ihe niile nke dị ya nʼobi.