2 Corinthians 1:12 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na otu ihe anyị ji na-anya isi, nke akọnuche anyị na-agwakwa anyị na ọ bụ eziokwu, bụ na mmeso anyị na-emeso ndị ọzọ, karịsịa mmeso anyị na-emeso unu, bụ mmeso nke obi ịdị ọcha na ikwu eziokwu site na ndabere anyị nꞌime Onyenwe anyị. Anyị emeghị nke a site nꞌamamihe ụwa a, kama site nꞌamara Chineke.
Igbo 2006
N'ihi na inya-isi-ayi bu nka, àmà nke akọ-na-uche-ayi, na ọ bu n'idi-nsọ na idi-ọcha nke Chineke, ọ bughi n'amam-ihe nke anu-aru, kama ọ bu n'amara Chineke, ka ayi biri obi n'uwa, ma ọ bu n'ebe unu nọ ka ayi bikariri obi-ayi nke-uku.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ịnya isi anyị bụ nke a, na akọnuche anyị na-agbara anyị akaebe na anyị kpara agwa ọma nʼụwa, karịchasịa nʼebe unu nọ, nʼịdị nsọ na izi ezi nke si nʼaka Chineke. Nke a bụ site nʼamara o nyere anyị, ọ bụghị site nʼamamihe nke mmadụ.