2 Corinthians 1:13 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Anyị na-edere unu nanị ihe anyị maara na unu nwere ike ịgụ ma ghọtakwa. Mgbe anyị na-edere unu akwụkwọ anyị, ọ dịghị ihe zoro ezo ọzọ anyị dere, bụ nke anyị na-achọghị ka unu ghọta.
Igbo 2006
N'ihi na ayi edegaraghi unu ihe ọzọ n'akwukwọ, ma-ọbughi ihe unu nāghọta ma-ọbu nke unu nāmazu kwa, anamele kwa anya na unu gāmazu ha rue ọgwugwu ihe nile:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na ihe anyị na-edere unu abụghị ihe unu na agaghị agụta maọbụ ghọta. Enwere m nchekwube na unu ga-aghọta ya nke ọma.