2 Corinthians 1:20 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na nkwa nile Chineke kwere mezuru nꞌime Jisọs Kraịst. Ọ bụ nꞌihi nke a ka anyị ji na-enye Chineke otuto a site nꞌaha Jisọs Kraịst.
Igbo 2006
N'ihi na ka ha ra, bú nkwa nke Chineke, ọ bu nime Ya ka e di: n'ihi nka ka Amen site-kwa-ra n'aka-Ya, ka ewe site n'aka-ayi nye Chineke otuto.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼime Kraịst ka anyị hụrụ “E” na nkwa niile nke Chineke kwere ụmụ mmadụ. Nke a mere anyị ji site na ya kwee “Amen” nʼinye Chineke otuto.