2 Corinthians 1:23 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Chineke bụ onye akaebe m, nꞌihi na ọ maara obi m, ọ maara na ekpebiri m ịhapụ ịbịa Kọrint nꞌihi na achọghị m ime ka obi jọọ unu njọ site na mba nke m bu nꞌobi ịbara unu.
Igbo 2006
Ma mu onwem nākpọku Chineke ka Ọ buru onye-àmà megide nkpuru-obim, na ọ bu n'imere unu ebere ka m'nējighi bia Kọrint rue ub͕u a.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ana m akpọku Chineke dịka onye akaebe m, ọ bụ nʼihi ịnapụta unu mere m ji hapụ ịbịa Kọrint.