2 Corinthians 1:24 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọbịbịa m ga-abịa abụghị ka m gwa unu ihe unu na-aghaghị ikwere, nꞌihi na okwukwe unu siri ike. Kama, ihe m chọrọ bụ ime ka ọṅụ unu dịwanye ukwuu.
Igbo 2006
Ọ bughi na ayi bu ndi-nwe okwukwe-unu, kama ayi bu ndi soro unu nālu ọṅù-unu: n'ihi na unu ji okwukwe-unu guzo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụghị na anyị bụ ndị ọchịchị nke okwukwe unu, kama anyị so unu na-arụkọ ọrụ ka unu nwe ọṅụ nʼihi na ọ bụ site nʼokwukwe ka unu ga-esi kwụrụ chịm.