2 Corinthians 1:6 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma ọ bụrụ na anyị na-ahụ ahụhụ, ọ bụ nꞌihi na anyị chọrọ ka a kasie unu obi, na ka a zọpụta unu. Ọ bụrụkwa na a na-akasị anyị obi, e sikwa ụzọ dị otu a enyere unu aka, nꞌihi na a na-enye unu ike na ume iji ntachi obi die ụdị ahụhụ nke anyị onwe anyị na-edikwa.
Igbo 2006
Ma ọ buru na anākpab͕u ayi, ọ bu n'ihi nkasi-obi-unu na nzọputa-unu; ọ buru kwa na anākasi ayi obi, ọ bu n'ihi nkasi-obi-unu, nke nālusi ọlu ike n'itachi obi n'otù ahuhu ahu nke ayi onwe-ayi nāhu kwa:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ọ bụrụ na anyị na-ahụ ahụhụ, ọ bụ nʼihi na nkasiobi unu, nakwa nzọpụta unu. Ọ bụrụkwa na a na-akasị anyị obi, ọ bụkwa nʼihi nkasiobi unu, nke na-arụpụta ike na ume iji ntachiobi die ụdị ahụhụ nke anyị onwe anyị na-edikwa.