2 Corinthians 10:15 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ bụghị na anyị na-ekwu na ọ bụ anyị rụrụ ọrụ nile, ya na ọrụ nke ndị ọzọ rụrụ nꞌetiti unu, kama olileanya anyị bụ na okwukwe unu nꞌime Chineke ga na-eto eto mgbe nile, ka ọrụ ahụ Chineke chọrọ ka anyị rụọ nꞌetiti unu bụrụ nke ga-eto eto.
Igbo 2006
ayi adighi-anya isi rue ihe anāpughi itù atù, nke ahu bu, na ndọb͕u ndi ọzọ dọb͕uru onwe-ha n'ọlu; ma ayi nēle anya na, mb͕e okwukwe-unu nāba uba kari, agēme ka ayi di uku n'etiti unu dika ihe-ọtùtù-ayi si di rue ibabiga-ókè,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụghị na anyị na-ekwu na ọ bụ anyị rụrụ ọrụ niile, ya na ọrụ nke ndị ọzọ rụrụ nʼetiti unu, kama olileanya anyị bụ na okwukwe unu ga na-eto eto mgbe niile, ka ọrụ ya nʼetiti unu bụrụ nke ga-eto eto.