2 Corinthians 10:16 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ka o si otu a bụrụ na mgbe anyị rụsịrị ọrụ anyị nꞌetiti unu, anyị gaenwekwa ike pụọ gaa izisa ozi ọma Kraịst nꞌebe ọzọ dị iche, ebe onye ọ bụla na-adịghị arụ ọrụ; mgbe ahụ o nweghị onye ga-ebo anyị ebubo na anyị na-arụ ọrụ anyị nꞌebe ndị ọzọ na-arụ ọrụ.
Igbo 2006
ka ayi we zisa ozi ọma rue ebe nile di n'ofè unu, ghara kwa inya isi bayere ihe edoziri ayi n'ihe-ọtùtù onye ọzọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nke a ga-eme ka anyị nwee ike zisaa oziọma ahụ na mba ndị ọzọ ndị dị nʼofe ala unu, ghara iji ọrụ arụrụ nʼebe ndị ọzọ na-arụ ọrụ na-etu ọnụ.