2 Corinthians 10:18 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na ọ baghị uru onye ọ bụla ịgwa onwe ya okwu sị, “Emere m nke ọma”. Kama ihe dị mkpa bụ Onyenwe anyị ịgwa anyị okwu sị, “Ị mere nke ọma”.
Igbo 2006
N'ihi na onye ya onwe-ya nēme ka amara ya, ọ bughi onye ahu ka anwaputaworo, kama ọ bu onye Onye-nwe-ayi nēme ka amara ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na ọ bụghị onye ji aka ya bulie onwe ya elu ka a na-anabata, kama ọ bụ onye Onyenwe anyị jiri aka ya bulie.