2 Corinthians 10:5 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Anyị na-eji ngwa agha ndị a emegide okwu ụgha nile na okwu nganga nile, nke ndị mmadụ na-eji ekpuchi eziokwu nile gbasara Chineke. Anyị na-ejikwa ngwa agha ndị a eme ka obi nile bụrụ ihe e meriri emeri irubere Kraịst isi.
Igbo 2006
ebe ayi nēweda ihe anātule n'obi, na ihe nile ọ bula di elu nke eweliri elu imegide ọmuma Chineke, ayi nādọta kwa ihe nile ọ bula anēchèputa n'agha iṅa nti Kraist;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Anyị na-ala ịrụ ụka niile na okwu ụgha niile nʼiyi, nke na-egbochiri ụmụ mmadụ ụzọ e si amata Chineke, na-eme ka echiche niile hulata isi nʼokpuru Kraịst.