2 Corinthians 10:8 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma ọ bụrụ na unu na-eche na m naanya isi banyere ike ahụ Chineke nyere m nꞌebe unu nọ, ike ahụ o nyere m iji wulie unu elu, ọ bụghị iji merụọ unu ahụ, aga m emekwa ka unu mata na ihere adịghị eme m ịnya isi otu ahụ.
Igbo 2006
N'ihi na asi na ọ bu ezie na m'gānyabiga isi ókè kari bayere ike-ayi (nke Onye-nwe-ayi nyere iwuli unu elu dika ulo, ọ bughi kwa iweda unu), agaghi-eme ka ihere mem:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ugbu a, ọ bụrụ na m anya isi banyere ikike ahụ Onyenwe anyị nyere m nʼebe unu nọ, ike ahụ o nyere m iji wulie unu elu, ọ bụghị iji wedaa unu ala, ihere agaghị eme m nʼihi nke a.