2 Corinthians 11:20 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ihe mmadụ ndị a na-eme unu agbasaghị unu. Ee, ọ gbasaghị unu ma ha mee unu ndị ohu ha. Ọ gbasaghị unu ma ha nakọrọ unu ihe nile unu nwere, mesoo unu mmeso dị ka ndị karịrị unu ike, ma ọ bụ ndị maara ihe karịa. Ọ gaghị agbasa unu ma ha tie unu aka nꞌihu.
Igbo 2006
N'ihi na unu nānagide ya, ma ọ buru na onye ọ bula eme ka unu buru orù, ọ buru na onye ọ bula eripia unu, ọ buru na onye ọ bula ejide unu, ọ buru na onye ọ bula eweli onwe-ya elu, ọ buru na onye ọ bula apia unu ihe n'iru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Unu na-anagide ya ma ọ bụrụ na onye ọbụla eme unu ndị ohu ha, maọbụ jiri anya ike nakọrọ unu ihe unu nwere, maọbụ ghọgbuo unu, maọbụ bulie onwe ya elu dịka ha karịrị unu, maọbụ maa unu uraa nʼihu.