2 Corinthians 11:21 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma ọ bụ na-asị na anyị bụ ndị na-enweghị ike! Nꞌezie, anyị nabatara ka unu kpọọ anyị ndị na-adịghị ike karịa na a ga-agụ anyị dị ka ndị na-emegbu unu. Ma ka m gwa unu, ihe ọ bụla ndị ahụ nwere, ma ọ bụ ihe ọ bụla ha bụ, nke na-eme ha ịnya isi, achọrọ m ka unu mata na m nwekwara otu ihe ahụ, na m bụkwa ihe ahụ ha bụ. Ma ana m ekwu okwu ndị a dị ka onye nzuzu.
Igbo 2006
Anamekwu okwu bayere ebubo ihere eboro ayi, dika nka, na ayi onwe-ayi bu ndi nādighi ike. Ma n'uzọ ọ bula onye ọ bula nwere anya-ike (ọ bu n'enweghi-uche ka m'nēkwu), mu onwem nwe-kwa-ra anya-ike.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼezie, ọ bụ ihere m, ịnabata na anyị bụ ndị na-adịghị ike nʼezie nye nke a. Ọ bụrụ na onye ọbụla anwaa anwaa nyaa isi nʼihe ọbụla (ana m ekwu dịka onye nʼenweghị uche), mụ onwe m ga-anyakwa isi.