2 Corinthians 11:23 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ha na-ekwu na ha bụ ndị na-ejere Kraịst ozi. Ma mụ onwe m ejerrela Kraịst ozi karịa ha nile (amaara m na ụdị okwu a m na-ekwu bụ ụdị okwu onye isi na-adịghị mma na-ekwu). Ma adọgbuola m onwe m nꞌọrụ karịa ha nile. Etinyela m nꞌụlọ mkpọrọ ọtụtụ mgbe nꞌihi ikwusa ozi ọma. Etiela m ihe otiti ọtụtụ mgbe. Mgbe mgbe kwa anọọla m nꞌọnụ ọnwụ.
Igbo 2006
Hà bu ndi nējere Kraist ozi? (anamekwu dika onye anya nādighi nma) mu onwem nēje kari; anamadọb͕ubiga onwem ókè n'ọlu kari, anamanọbiga ókè n'ulo-nkpọrọ kari, anāpiam utari nke-uku ri nne, anọm n'ọnu ọnwu ọtutu mb͕e.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha bụ ndị na-ejere Kraịst ozi? (Ana m ekwu dịka onye anya na-adịghị mma.) Ma mụ onwe m ejela ozi karịa. Adọgbuola m onwe m nʼọrụ karịa ha niile. Etinyela m nʼụlọ mkpọrọ ọtụtụ mgbe, tinyere ọtụtụ ihe otiti, mgbe mgbe anọọla m nʼọnụ ọnwụ.