2 Corinthians 11:26 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ejeela m ọtụtụ ogologo ije nke ọtụtụ ihe ize ndụ dị nꞌime ya. Ọtụtụ mgbe ka mmiri gaara eri m. Ọtụtụ mgbe ka ndị na-apụnarị mmadụ ihe nꞌike gaara ala ndụ m nꞌiyi. Ọtụtụ mgbe kwa ka ndị Juu, ndị obodo nke aka m chọrọ igbu m. Otu a kwa, ọtụtụ mgbe ka m na-eze ndụ m ka ndị mba ọzọ ghara igbu m. Nꞌọtụtụ obodo ukwu, igwe ndị mmadụ achọọla itigbu m, ọtụtụ oge dịkwa mgbe m gaara etufu ndụ m nꞌọzara ma nꞌoke osimiri, na nꞌaka ndị kpọrọ onwe ha ụmụnna m, ma ha bụ ndị iro m nꞌezie.
Igbo 2006
n'ije ọtutu mb͕e, n'ize-ndu site n'osimiri, n'ize-ndu site na ndi nāpunara madu ihe, n'ize-ndu site na ndi mba nkem, n'ize-ndu site na ndi mba ọzọ, n'ize-ndu nime obodo, n'ize-ndu nime ọhia, n'ize-ndu nime oké osimiri, n'ize-ndu n'etiti umu-nna ugha;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ejeela m ọtụtụ ogologo ije nke ọtụtụ ihe ize ndụ dị nʼime ya. Nʼize ndụ site nʼosimiri, ize ndụ site na ndị na-apụnarị mmadụ ihe nʼike, ize ndụ site nʼaka ndị obodo nke aka m. Ọtụtụ mgbe ka m zere ndụ site nʼaka ndị mba ọzọ, nʼime obodo ukwu, nʼọzara ma nʼoke osimiri; na nʼaka ndị kpọrọ onwe ha ụmụnna m, ma ha bụ ndị ụgha.