2 Corinthians 11:3 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma ana m atụ egwu, nꞌihi na ọ na-adị m ka unu gaekwe ka ụfọdụ mmadụ duhie unu, mee ka unu ghara iwere obi unu nile hụ Onyenwe anyị nꞌanya, dị ka agwọ ahụ si jiri aghụghọ ghọgbuo Iiv.
Igbo 2006
Ma anamatu egwu, ma ọ nwere uzọ ọ bula agēmebi uche-unu ka unu pua n'afọ-ofufo na idi-ọcha nke di n'ebe Kraist nọ, dika agwọ ahu were aghughọ-ya ghọb͕ue Iv.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ana m atụ egwu, na dịka agwọ jiri aghụghọ ghọgbuo Iiv, ndị nrafu ga-eji aghụghọ duhie unu, mee ka unu kwụsị iji obi dị ọcha na uche ziri ezi jeere Kraịst ozi.