2 Corinthians 11:4 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ pụtara ìhè na ọ gaghị abụ ihe siri ike ụfọdụ mmadụ ịbịakwute unu duhie unu, nꞌihi na ọ bụ ihe e jiri mara unu bụ ịnabata onye ọ bụla bịakwutere unu kwusaara unu Jisọs ọzọ nke naabụghị nke anyị na-ekwusa. Ma ọ bụ kwusaara unu ihe banyere mmụọ ozi dị iche, ma ọ bụ zi unu ụzọ ọzọ dị iche a ga-esi zọpụta unu. Unu ga-anabata ozizi ahụ nile.
Igbo 2006
N'ihi na asi na onye ahu nke nābia nēkwusa Jisus ọzọ, onye ayi nēkwusaghi, ma-ọbu asi na unu nānara mọ di iche, nke unu nānaraghi, ma-ọbu ozi ọma di iche, nke unu nānaraghi nke-ọma, unu nānagide ya nke-ọma.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na unu gaara anara onye ọzọ bịakwutere unu na-ekwusa Jisọs ọzọ nke na-abụghị nke anyị kwusara, unu gaara anarakwa ike nke mmụọ ọzọ dị iche na-abụghị ike nke Mmụọ Nsọ ahụ unu natara, unu gaara ekwenyekwa na nkuzi ọzọ dị iche, na-abụghị oziọma ahụ nke unu natara.