2 Corinthians 11:6 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
A sịkwarị na m amaghị okwu ekwu, ihe m na-ekwu doro m anya. Nꞌihi na o were m anya na unu onwe unu maara nke a, nꞌihi na anyị emeela ka ike ahụ dị nꞌozi ọma anyị na-ekwusa pụta ìhè nꞌihu unu ọtụtụ mgbe.
Igbo 2006
Ma asi na ọ bu ezie na abum onye nāmutaghi akwukwọ n'uzọ ikwu okwu, ma abughi m otú a n'uzọ ihe-ọmuma; kama ayi mere ka ọ puta ìhè nye unu n'ihe nile ọ bula n'etiti madu nile.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na m abụghị onye ọka okwu, abụ m onye ọka mmụta. Anyị akọwarala unu nke a ọtụtụ mgbe nʼụzọ dị iche iche nʼihe niile.