2 Corinthians 12:10 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ya mere, ebe m maara na ahụ mgbu a na-ewetara Kraịst otuto, obi dị m ụtọ na m nwere ya. Ana m aṅụrịkwa ọṅụ mgbe a naakọcha m, mgbe m nọ nꞌọnọdụ mkpa, mgbe a na-akpagbu m, na nꞌọnọdụ nsogbu nile. Nꞌihi na mgbe ahụ m na-adịghị ike, mgbe ahụ ka Kraịst naenye m ike.
Igbo 2006
N'ihi nka adighi-ike nile na imem ihe-ihere nile na nkpà nile na nsob͕u nile na oké nkpà nile n'ihi Kraist dim ezi nma: n'ihi na mb͕e ọ bula m'nādighi ike, mb͕e ahu ka m'nādi ike.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ nʼihi Kraịst ka m na-anọgide nʼadịghị ike m niile, mkparị ndị mmadụ, ihe isi ike niile, mkpagbu niile na ihe ndakwasị dị iche iche. Nʼihi na mgbe m na-adịghị ike ka m na-enwe ike karịa.