2 Corinthians 12:11 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụ unu mere m ji si otu a kwuo okwu. Nꞌihi na ọ bụ onwe unu kwesịrị ide ihe ndị a banyere m, ọ bụghị m kwesịrị ide ha. O nweghị ihe ọ bụla mmadụ ndị a unu na-anabata nwere nke m na-enweghị. Ma nꞌezie, abụghị ihe ọ bụla.
Igbo 2006
Aghọwom onye nēnweghi uche: unu onwe-unu rugiderem; n'ihi na ugwọ unu ji mu onwem bu ime ka amaram: n'ihi na ọ dighi uzọ ọ bula m'nērughi ndi kachasi elu n'etiti ndi-ozi, asi na ọ bu ezie na abughi m ihe ọ bula.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Emeela m onwe m onye nzuzu ma unu onwe unu rugidere m ime ya. O kwesiri ka unu bụrụ ndị mbụ ga-eto m. Ọ bụ ezie a na-abụghị m ihe ọbụla, ma o were m anya na ọ dịghị ụzọ ọbụla m si dị ala nʼebe ndị ahụ unu na-eche na ha kachasị elu nʼetiti ndị ozi.