2 Corinthians 12:13 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ihe ọzọ m na-emere ụlọ nzukọ ndị ọzọ nke m jụrụ imere unu bụ ịnara unu ihe oriri na ịrịọ unu ebe obibi. Bikonụ gbaghara m nꞌihi ihe ọjọọ a m mere unu.
Igbo 2006
N'ìhi na gini bu ihe ahu nke emere ka unu la ala nime ya kari nzukọ Kraist fọduru, ma-ọbughi na mu onwem abughi unu ibu arọ́? b͕agharanum ajọ omume a.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Olee ụzọ unu si dị ala nʼebe chọọchị ndị ọzọ dị, ma ọ bụghị na m abụghị ibu arọ nye unu? Gbagharanụ m mmejọ a.