2 Corinthians 12:14 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nke a bụ ugboro atọ m na-ejikere ịbịakwute unu. Ọ dịkwaghị ihe ọbịbịa m ga-efu unu, nꞌihi na achọghị ego unu. Ọ bụ unu onwe unu ka m chọrọ. Unu bụ ụmụ m. Ọ bụkwaghị ọrụ ụmụntakịrị ịkwụrụ nne na nna ha ụgwọ nri ha riri. Ọ bụ nne na nna na-azụtara ụmụ ha nri ha naeri.
Igbo 2006
Le, nka bu ub͕ò nke-atọ m'nọ dika onye edoziworo ibiakute unu; m'gaghi-abu kwa ibu arọ́: n'ihi na achọghi m ihe-unu, kama ọ bu unu onwe-unu: n'ihi na ọ bughi ọlu umu ikpadoro ndi muru ha ihe, kama ọ bu ọlu ndi muru umu ikpadoro umu-ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nke a bụ ugboro atọ m na-ejikere ịbịakwute unu. Agaghị m abụrụ unu ibu arọ, ihe dị m mkpa abụghị akụ unu nwere, kama unu onwe unu. Ọ bụghị ụmụntakịrị ka ọ dịrị ịkpadoro nne na nna ha ihe, kama ọ bụ ọrụ dịrị nne na nna ịkpadoro ụmụ ha ihe.